Hosea 5

Ikpe ọmụma megide Izrel

1“Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụaja!
Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel!
Geenụ ntị, unu ndị ezinaụlọ eze.
Nʼihi na ọ bụ unu ka ikpe ahụ gbasara.
Nʼihi na unu abụrụla ihe ị maa nʼọnya na Mizpa,
na ụgbụ agbasara nʼelu Taboa.
2Ndị nnupu isi ahụ abamiela ime nʼigbu mmadụ,
aga m ata ha niile ahụhụ.
3Amaara m ihe niile gbasara Ifrem,
ọ dịkwaghị ihe zoro ezo banyere Izrel nʼebe m nọ.
Gị Ifrem, ugbu a ị gbawala akwụna;
gị Izrel, emerụọkwala gị.

4“Omume ha agaghị ekwe
ka ha laghachikwute Chineke ha,
nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko ewerela ute biri nʼime ha,
ha amaghịkwa Onyenwe anyị.
5Mpako niile nke Izrel na-agba ama megide ha,
Ọ bụladị Izrel na Ifrem na-asọ ngọngọ nʼime mmehie ha,
Juda, nʼonwe ya, soo ha na-asọ ngọngọ.
6Mgbe ha ga-eji igwe ewu na atụrụ ha na igwe ehi ha,
gaa ịchọ Onyenwe anyị,
ha agaghị achọta ya.
Nʼihi na o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya.
7Ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị.
Ha mụrụ ụmụ a kwatara nʼiko.
Ugbu a, mmemme ọnwa ọhụrụ ha
ga-eripịa ha na ala ubi ha.

8“Fụọ opi ike na Gibea,
fụkwaa mpi anụ na Rema.
Tie mkpu agha na Bet-Aven.
Lee anya nʼazụ gị, Benjamin.
9A ga-ebibi Ifrem kpamkpam
nʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ.
Maọbụ, nʼụbọchị ntaramahụhụ

Nʼetiti ebo nke Izrel niile,
ka m na-ekwusa ka amara na ọ bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.
Ya bụ, okwu nʼaghaghị imezu

10Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụ
na-ewezuga oke ala,
aga m awụkwasị ha iwe m
dịka uju mmiri ozuzo.
11Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu,
onye e ji ike na-azọpịa,
nʼihi na ọ kpacha anya na-achụso ihe efu.
12Adị m ka nla nye Ifrem,
dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda.

13“Mgbe Ifrem hụrụ ụdị ọrịa ọ na-arịa,
Juda ahụkwa ọnya dị ya nʼahụ,
mgbe ahụ Ifrem gakwuru ndị Asịrịa,
ma zigakwara eze ukwu ahụ ozi.
Ma ọ pụghị ịgwọ gị,
maọbụ gwọọ ọnya gị niile.
14Nʼihi na-aga m adị ka ọdụm nye Ifrem
dịkwa ka nwa ọdụm nye Juda.
Aga m adọkasị anụ ahụ ha ma hapụ ha pụọ.
Aga m ebupụ ha pụọ, na-enweghị onye ga-abịa ịzọpụta ha.
15Aga m alaghachi azụ nʼọnọdụ m,
ruo mgbe ha kweere na ikpe mara ha,
ma chọọ ihu m;
nʼọnọdụ mmekpa ahụ ha,
ha ga-achọsi m ike.”
Copyright information for IboBIU